Education Health

NACESS Etoola Akanachî Enugu Steeti Maka Mgbata Ôsô Enyemaka bụ nke ogbatara, n’ebe ụmụ akwụkwọ Enugu,bụ ndị na agụ akwụkwọ na mahadum Jos nọ

Share and Enjoy !

Shares

NACESS Etoola Akanachî Enugu Steeti Maka Mgbata Ôsô Enyemaka bụ nke ogbatara, n’ebe ụmụ akwụkwọ Enugu,bụ ndị na agụ akwụkwọ na mahadum Jos nọ

Lee Video;

https://youtu.be/oAAW6CRF1eA

https://youtu.be/4AdJLyAHwOo

Ndị otu jikọtara ụmụ akwụkwọ Enugu niile enwere na mba ụwa dum, bụ ndị otu nke ana akpọ “National Council of Enugu State Students” (NACESS) etoolaa Akanachi Enugu steeti bụ Rt Hon Ifeanyichukwu Lawrence Ugwuanyi, maka mgbata ọsọ enyemaka, bụ nke ogbatara, n’ebe ụmụ akwụkwọ Enugu,bụ ndị na agụ akwụkwọ na mahadum Jos nọ.

Obu Onyisi nke ndị otu ahu bu :Comrade Onyemaechi Onah, bụ onye kwupụtara nkea tata, site na akwụkwọ ozi ekele, bụ nke osiri na obodo jordan, bụ ebe ọnọ njem ala nsọ kitaa, wee zigara ndị ndị nta akụkọ.

NOKWU ya, ka Comrade Onyemaechi Onah nọrọ wee kwuo, na obi dị ndị Otu ha bụ NACESS mma ofuma, n’ebe onyisi ọchịchị bụ Ifeanyi Ugwuanyi nọ, makana ha rịọrọ ya, ka ogbatara ụmụ akwụkwọ Enugu, bụ ndị nọ na jos agụ akwụkwọ , bụ obodo ogbaghara daputagokwara naya ọsọ enyemaka, maka ikpolata ha ụlọ, ka ha yara ibu ndị ogbaghara ahụ ga eri, bụkwa nke osiri, na onyisi ọchịchị bụ :Ifeanyi Ugwuanyi nụrụ ozigbo ozigbo, ma nyekwa iwu, ka eziga ụgbọala na ndị ọrụ nchekwa, ga aga, wee kpolata ha ụlọ.

Ogakwara na ihu wee kwuo na soso onye ga akpanwu ụdị àgwà di etuahu, bụ onye hụrụ ndị ona achị na anya nke ukwuu, ji ndụ nke ndị mmadụ, wee kpọrọ ihe, bụkwa nke osikwara ọzọ, na oburugo ihe njirimara Ifeanyi Ugwuanyi dịka Onyisi ọchịchị Enugu.

Ndị NACESS, riokwara, ka ụmụ akwụkwọ Enugu niile nọ na jos, nyere mbọ nke Ifeanyi Ugwuanyi gbagoro maka ikpolata ha aka, site na, ime ihe ndị ha kwesịrị ime, ka njem ha, wee gaa ofuma.

Ma kwukwaaa na :ụmụ akwụkwọ Enugu, gana akwado ọchịchị Ifeanyi Ugwuanyi oge ọbụla.

Share and Enjoy !

Shares

If you liked this article, then please join our WhatsApp Group for More tutorials. You can also find us on Twitter and Facebook.

Disclaimer: Contents provided and/or opinions expressed here do not reflect the opinions of The Charity Reporters or any employee thereof.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *